Jeremiah 17

1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,
jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ
Nkume a na-egbuke ka ọla dịamọndu
ya apị,
depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha,
nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,
na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera,
nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ,
ma nʼelu ugwu nta niile.
3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,
na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha
ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.
Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,
nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,
nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.
Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị
nʼala nke ị na-amaghị,
nʼihi na ị kpasuola iwe m,
ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,

“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,
onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,
onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.
Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,
nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.

7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.
Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.
8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.
Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,
akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.
Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.
Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”

9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,
o nwekwaghị ngwọta.
Onye pụrụ ịghọta ya?

10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,
na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,
nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,
na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”

11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,
otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị.
Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha.
Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.

12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,
ka ebe nsọ anyị bụ.
13 Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ.
A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ.
A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala,
nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị,
isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.

14 Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.
Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara,
nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.
15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m,
“Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị?
Ya mezuonụ ugbu a!”
16Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m.
Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba.
Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.
17A ghọrọla m ihe na-eyi egwu,
nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.
18Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m.
Ekwekwala ka ihere mee m.
Mee ka ha tụọ ụjọ,
ma chebe m site nʼihe egwu.
Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha,
werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.

Idebe Ụbọchị Izuike nsọ

19Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem. 20Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’ 21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya. 22Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu. 23Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya. 24Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya, 25mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi. 26Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị. 27Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

Copyright information for IboBIU